26 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji nile n'oké ike na ebube.
27 Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe.
28 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;
29 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo.
30 N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.
31 Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.
32 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat'aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.