22 Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum.
23 O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya.
24 O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu.
25 N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.
26 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
27 Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya.
28 Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.