30 Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ.
31 Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru.
32 Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere.
33 O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.
34 O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche.
35 O we ga n'iru nke-ntà, da n'ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me.
36 O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ.