9 Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
10 Judas Iskariot, onye nke bu otù nime ndi-ozi iri na abua ahu, we jekuru ndi-isi-nchu-àjà, ka o we rara Ya nye n'aka-ha.
11 Ma mb͕e ha nuru ya ha ṅuria ọṅu, we kwe nkwa inye ya ego. Ọ we nāchọ oghere o gēsi rara Ya nye.
12 N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga?
13 O we zipu madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya;
14 ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?
15 Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n'ebe ahu dozienu ihe nye ayi.