24 Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n'ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n'iwu?
25 O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya?
26 Otú ọ batara n'ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ?
27 O we si ha, Emere ubọchi-izu-ike n'ihi madu, emeghi madu n'ihi ubọchi-izu-ike:
28 ya mere Nwa nke madu ji buru kwa Onye-nwe ubọchi-izu-ike.