23 we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu.
24 O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya.
25 Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua,
26 nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ,
27 ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka.
28 N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.
29 Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu.