28 we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya.
29 Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì.
30 Ndi-ozi Jisus we zukọ n'ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa.
31 O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe.
32 Ha we je n'ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia.
33 Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ.
34 O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.