26 O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à.
27 Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu?
28 Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma.
29 Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu.
30 O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya.
31 O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.
32 Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba.