30 ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo.
31 Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele.
32 Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.
33 Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n'iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.
34 Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha.
35 N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya:
36 ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya.