Matiu 13 IGBOB

1 N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri.

2 Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú.

3 O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;

4 mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:

5 nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7 Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

8 Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

9 Onye nwere nti, ya nu.

10 Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu?

11 O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.

12 N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

13 N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.

14 Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si,N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:

15 N'ihi na obi ndi nka mara abuba,Nti-ha kpọchi-kwa-ra,Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.

16 Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe.

17 N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.

18 Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu.

19 Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.

20 Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya;

21 ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà.

22 Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

23 Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

24 O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya:

25 ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la.

26 Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè.

27 Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n'ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata?

28 Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha?

29 Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata.

30 Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem.

31 O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya:

32 nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya.

33 Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

34 Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n'ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula:

35 ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si,M'gāsaghe ọnum n'itu ilu;M'gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa.

36 Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n'ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n'ubi ahu.

37 O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu;

38 ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu;

39 onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu ọgwugwu oge a; ndi ahu nēwe ihe-ubi bu ndi-mọ-ozi.

40 Ya mere dika anāchikọputa ata rechapu kwa ha n'ọku; otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a.

41 Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu,

42 ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

43 Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu.

44 Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu.

45 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma:

46 ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya.

47 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche:

48 nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma.

49 Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume,

50 ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

51 Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E.

52 O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie.

53 O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie.

54 O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike?

55 Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas?

56 Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n'etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile?

57 Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya.

58 Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28