Matiu 4 IGBOB

1 Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya.

2 Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya.

3 Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.

4 Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.

5 Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n'obodo nsọ; o we guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke,

6 si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.

7 Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

8 Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha;

9 o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem.

10 Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

11 Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.

12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;

13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:

14 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15 Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,

16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.

17 Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

18 Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

19 O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.

20 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

21 O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.

22 Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.

23 Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.

24 Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.

25 Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28