7 N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ.
8 Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.
9 O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya;
10 o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ.
11 Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya.
12 Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus.
13 Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.