9 O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya;
10 o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ.
11 Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya.
12 Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus.
13 Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.
14 O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.
15 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri.