22 Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike.
23 Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu.
24 Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel.
25 Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka.
26 Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.
27 Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha.
28 Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu.