7 Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,
8 Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha;Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
9 Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.
10 O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu:
11 Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.
12 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu?
13 Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.