1 N'oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n'ala-eze elu-igwe?
2 O we kpọ otù nwatakiri biakute Ya, Ọ debe ya n'etiti ha,
3 si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.
4 Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n'ala-eze elu-igwe.
5 Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma:
6 ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n'ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, ka o mìkpu kwa n'ob͕u oké osimiri.
7 Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia.