19 Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
20 Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime?
21 Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
22 Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.
23 Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n'ala-eze elu-igwe.
24 Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.
25 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n'aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa?