14 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt;
15 O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam.
16 Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.
17 Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si,
18 Anuru olu na Rema,Ikwa-ákwá na iru-újú uku,Rechel nākwara umu-ya ákwá;Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n'ihi na ha adighi.
19 Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n'Ijipt,
20 si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n'ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo.