12 Jisus we ba n'ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;
13 Ọ si ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.
14 Ndi-ìsi na ndi-ngwurọ we biakute Ya n'ulo uku Chineke: O we me ka aru-ha di ike.
15 Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n'ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku,
16 ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?
17 O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
18 Ma n'ututu mb͕e Ọ nālaghachi n'obodo ahu, agu guru Ya.