5 Sinu ada Zaion,Le, Eze-gi nābiakute gi,Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu,Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.
6 Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu,
7 ha we sekputa inyinya-ibu ahu, na nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ha uwe-ha; O we nọkwasi ha.
8 Ndi kariri n'ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n'osisi, tusa kwa ha n'uzọ.
9 Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu.
10 Mb͕e Ọ batara na Jerusalem, obodo ahu nile we ma jijiji, si, Ònye bu Nwoke a?
11 Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.