1 Jisus we za, gwa ha okwu ọzọ n'ilu, si,
2 Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke,
3 zipu kwa ndi-orù-ya ikpọ ndi akpọrọri ibia n'oriri ọlulu-nwunye ahu: ma ha achọghi ibia.
4 Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n'oriri ọlulu-nwunye nkem.