16 Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.
17 Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi?
18 Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?
19 Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.
20 Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?
21 Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.
22 Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.