34 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe.
35 Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya,
36 si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi?
37 Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.
38 Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu.
39 Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
40 Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.