36 si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi?
37 Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.
38 Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu.
39 Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
40 Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
41 Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha,
42 si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid.