40 Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
41 Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha,
42 si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid.
43 Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,
44 Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua?
45 Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya?
46 Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.