7 na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai.
8 Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.
9 Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n'elu uwa: n'ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe.
10 Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n'ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu.
11 Ma onye dikariri uku n'etiti unu gābu onye nējere unu ozi.
12 Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.
13 Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.