37 Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.
38 N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya,
39 ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.
40 Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù:
41 ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.
42 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.
43 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.