39 Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha,
40 nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'elu obe ridata.
41 Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nēme Ya ihe-ọchì, si,
42 Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.
43 Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke.
44 Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n'obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu.
45 Ma site n'oge hour nke-isi ọchichiri b͕ara n'ala ahu nile rue oge hour nke-iteghete.