4 si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu.
5 O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.
6 Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n'iwu itubà ha n'ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara.
7 Ha we b͕a ìzù, chiri ha zuta ubi ọkpu-ite, ilì ndi-ọbìa.
8 N'ihi nka ka akpọrọ ubi ahu, Ubi ọbara, rue ta.
9 Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya;
10 ha we nye ha iji zuru ubi ọkpu-ite, dika Onye-nwe-ayi nyerem iwu.