4 site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.
5 Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe.
6 Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ.
7 Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.
8 Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n'ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a.
9 Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.
10 Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam.