7 Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.
8 Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n'ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a.
9 Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.
10 Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam.
11 Ma mb͕e ha nāga, le, ufọdu nime òtù ndi-nche batara n'obodo ahu, kọrọ ndi-isi-nchu-àjà ihe nile mere.
12 Mb͕e ha na ndi-okenye zukọrọ, b͕a kwa ìzù, ha we nye ndi-agha ahu ego riri nne,
13 si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n'abali, zuru Ya n'ori mb͕e ayi nāraru ura.