1 Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia,
2 si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.
3 N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.
4 Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.
5 Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya;
6 ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.