10 Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
11 Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.
12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;
13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:
14 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
15 Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,
16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.