12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;
13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:
14 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
15 Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,
16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.
17 Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.
18 Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.