9 Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ.
10 Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa.
11 Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta.
12 B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.
13 Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.
14 N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.
15 Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.