2 onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo;
3 enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.
4 Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n'uzọ iri n'isi ihe alutara n'agha.
5 Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta:
6 ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n'uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia.
7 Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.
8 Ọzọ, n'ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n'uzọ iri; ma n'ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu.