8 N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,
9 ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
10 Ọzọ kwa Ọ si,Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ.
11 Ọzọ kwa,Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile;Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya.
12 Ọzọ kwa, Aisaia si,Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi,Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile;Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.
13 Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.
14 Ma emewom ka m'kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n'idi-nma, na emejuwo kwa unu n'ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú.