2 ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.
3 Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya.
4 Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.
5 O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n'aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n'ebe Chineke nọ, na n'ebe oche-eze-Ya di.
6 Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.
7 Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;
8 ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.