9 O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie.
10 M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.
11 M'we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n'ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha.
12 Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.
13 Eb͕okwasiwo kwa Ya uwe nke efesaworo ọbara: akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke.
14 Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu.
15 Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.