4 Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n'anya ahu i nwere na mbu.
5 Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.
6 Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.
7 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.
8 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu:
9 Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.
10 Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.