3 Ọ dighi kwa onye ọ bula di n'elu-igwe, ma-ọbu n'elu uwa, ma-ọbu n'okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.
4 M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:
5 otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.
6 M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.
7 O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.
8 Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.
9 Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,