9 Ma Sọl, onye anākpọ kwa Pọl, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legidere ya anya,
10 si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?
11 Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.
12 Mb͕e ahu onye-isi ahu, mb͕e ọ huru ihe meworo, o kwere, ebe ibobo ozizí nke Onye-nwe-ayi nwuru ya n'aru.
13 Pọl-hà we si na Pafọs nupu ub͕ọ, bia rue Paga di na Pamfilia: jọn we rapu ha, laghachi na Jerusalem.
14 Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.
15 Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.