7 ndi Jeson kpọbataworo: ndia nile nēmegide kwa iwu nile nke Sisa, ebe ha nāsi na Eze di iche di, bú Jisus.
8 Ha we me ka obi lọ ìgwè madu ahu na ndi-isi obodo miri, mb͕e ha nuru ihe ndia.
9 Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n'aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la.
10 Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.
11 Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.
12 Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom.
13 Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri.