12 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n'etiti ndi-dike atọ ahu.
13 Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n'ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n'iru ndi Filistia.
14 Ha we guzo onwe-ha n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku.
15 Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.
16 Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.
17 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama?
18 Ndikom atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma Devid ekweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova,