39 Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.
40 Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham.
41 Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu.
42 Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.
43 Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.