17 Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:
18 Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.
19 Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi!Ndi-dike esiwo aṅa da!
20 Unu egosila ya nime Gat,Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon;Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.
21 Unu ugwu Gilboa,Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.
22 Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,Uta Jonatan esighi na ha la azu,Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.
23 Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;Ha di garagara kari ugo,Ha di ike kari ọdum.