23 Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;Ha di garagara kari ugo,Ha di ike kari ọdum.
24 Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá,Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche,Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.
25 Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu!Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.
26 Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan:I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ:Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube,Kari ihu-n'anya ndinyom.
27 Ndi-dike esiwo aṅa da!Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!