21 Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.
22 Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu.
23 Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem.
24 Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya;
25 O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova.
26 Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze.
27 Joab we zigara Devid ndi-ozi, si, Ebusowom Raba agha, ewerewokwam obodo miri.