1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.
2 O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula.
3 Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.
4 O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya.