27 Absalom we rugide ya, o we zie Amnon na umu-ndikom eze nile ka ha soro ya je.
28 Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.
29 Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.
30 O rue, mb͕e ndi ahu nọ n'uzọ, na akukọ ahu biaruru Devid nti, si, Absalom eb͕uwo umu-ndikom eze nile, ọ dighi kwa otù onye fọduru nime ha.
31 Eze we bilie, dọwa uwe-ya nile, dina n'ala; ndi-oru-ya nile nēguzo kwa, ha na uwe-ha dọwara adọwa.
32 Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n'ihi na edoro nka n'okwu-ọnu Absalom site n'ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.
33 Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.